Acts 17:25 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Otu aka ahụ, mmadụ ọ bụla apụghị isite nꞌike aka ya jeere ya ozi nꞌụzọ kwesịrị. Nꞌihi na ọ dịghị ihe na-akpa Chineke mkpa. Ya onwe ya na-enye ndụ na ume na ihe nile. Ọ na-egbokwa mkpa nile.
Igbo 2006
ejighi kwa aka madu jere ya ozi, dika o nwere ihe ọ bula di Ya nkpà, ebe Ya onwe-ya nēnye madu nile ndu, na ume, na ihe nile;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu aka ahụ, ọ dịghị anara ije ozi site nʼaka mmadụ, dịka a ga-asị na o nwere ihe kọrọ ya. Ya onwe ya na-enye ndụ na ume na ihe niile. Ọ na-egbokwa mkpa niile.