Acts 17:26 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụ ya kere mmadụ nile site nꞌotu nwoke. O mere ka mba dị iche iche dị nꞌelu ụwa. Ọ bụkwa nanị ya na-ekpebi ihe banyere mbilite na ọdịda nke mba nile. Ọ matakwara ihe banyere oge nile a kara aka na njedebe ihe nile e kere eke.
Igbo 2006
O we site n'otù onye kè mba nile n'otù n'otù nke madu, ka ha biri n'elu uwa nile, mb͕e O debesiri oge-ha akaworo àkà na ókè nile nke ebe-obibi-ha;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O sitere nʼaka otu onye, bụ mmadụ mbụ ahụ, kee agbụrụ niile nke mmadụ nʼotu nʼotu, ka ha biri nʼelu ụwa dum. O jiri aka ya kewachaa oge ọgbọ ọbụla ga-anọ na oke niile nke ebe obibi ha.