Acts 17:29 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụrụ na nke a bụ eziokwu, anyị ekwesịghị iche na Chineke dị ka ihe mmadụ jiri aka ya kpụọ. A pụkwaghị iwere ọlaọcha na ọlaedo ma ọ bụ nkume kpụọ Chineke!
Igbo 2006
Ya mere ebe ayi bu ndi Chineke muru, o kwesighi ka ayi nēchè na Ihe akpọrọ Chineke yiri ọla-edo, ma-ọbu ọla-ọcha, ma-ọbu nkume, ihe apiri api site na ǹkà na ihe di n'obi madu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ebe anyị bụ ndị Chineke mụrụ, o kwesighị ka anyị na-eche na ihe akpọrọ Chineke yiri ọlaọcha maọbụ ọlaedo, maọbụ nkume, ihe apịrị apị site na ǹka na ihe dị nʼobi mmadụ.