Acts 17:3 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ na-akọwakwa ihe ndị amụma kwuru banyere ahụhụ nile Onye nzọpụta ga-ahụ na mbilite nꞌọnwụ ya. Site nꞌokwu ndị a o mekwara ka ha mata na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ.
Igbo 2006
nēmeghe ha, nēche kwa n'iru ndi ahu, na Kraist-ha aghaghi ihu ahuhu, na isi na ndi nwuru anwu bilie; nēgosi kwa na Jisus nka, Onye mu onwem nēkwusara unu, ka o kwuru, bu Kraist ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
na-akọwara ha na-edokwa ha anya na ọ dị mkpa na Kraịst ga-ahụ ahụhụ, ma sitekwa nʼọnwụ bilie. Ọ sịrị, “Jisọs a, nke m na-ekwusara unu bụ Kraịst ahụ.”