Acts 17:31 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na o debela otu ụbọchị mgbe ọ ga-ekpe ụwa nile ikpe nꞌụzọ ezi omume. Nke a bụ site nꞌaka Onye ahụ ọ họpụtara. O mekwara ka okwu a guzosie ike, mgbe o mere ka Onye ahụ si nꞌọnwụ bilie.”
Igbo 2006
ebe O debeworo otù ubọchi, nke Ọ gēkpe elu-uwa dum madu bi ikpé n'ezi omume nime ya site n'aka otù Nwoke Ọ kara àkà; O nye-kwa-ra madu nile ihe ha gēji kwere nka, ebe Ọ mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na o debela otu ụbọchị mgbe ọ ga-ekpe ụwa niile ikpe nʼụzọ ezi omume, site nʼaka otu nwoke ọ họpụtara. O mekwara ka nke a guzosie ike, mgbe o mere ka onye ahụ sị nʼọnwụ bilie.”