Acts 17:5 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma ndị isi Juu jupụtara nꞌekworo, nꞌihi ọrụ ndị a. Ha kwalitere obi ụfọdụ mmadụ efu nꞌetiti ha. Ndị a malitekwara ọgba aghara nꞌụzọ dị iche iche. Ha tikasịrị ụlọ Jesin, nꞌihi na ha chọrọ ịdọkpụta Pọl na Sailas, inyefe ha nꞌaka ụlọ ikpe obodo ahụ, ka e nye ha ntaramahụhụ.
Igbo 2006
Ma ndi-Ju, ebe ha nēkwo ekworo, ha kuru ajọ ndikom ufọdu nime ndi nēguzo n'efu n'ọma-ahia ka ha so ha, ha we kpọkọta ìgwè madu, me ka obodo ahu tua ùzù; ha we biakwasi ulo Jeson, chọ uzọ ikuputa ha n'iru ọra madu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ndị Juu jupụtara nʼekworo, nʼihi ya, ha kpaliri obi ụfọdụ mmadụ efu nʼetiti ha nʼọma ahịa. Ndị a malitekwara ọgbaaghara nʼụzọ dị iche nʼime obodo. Ha tikasịrị ụlọ Jesin, nʼihi na ha chọrọ ịdọpụta ha nyefee ha nʼaka ọha mmadụ.