Acts 18:15 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma ebe unu na-ekwu ihe banyere ihe mmụta dị iche iche na ịrụ ụka site nꞌiwu na-achị ndị Juu, gaanụ dozie ya nꞌonwe unu. Okwu ahụ agbasaghị m, achọghị m itinye ya ọnụ ma ọlị.”
Igbo 2006
ma ọ buru na ha bu ajuju bayere okwu-ọnu di iche iche na aha di iche iche na iwu nke aka unu, unu onwe-unu le ha anya; mu onwem ezubeghi ibu onye-ikpé okwu ndia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ebe unu na-ekwu ihe banyere okwu na aha dị iche iche nakwa iwu unu, gaanụ dozie ya nʼonwe unu. Agaghị m abụ onye ikpe okwu ihe ndị dị otu a.”