Acts 18:24 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Otu ọ dị e nwere otu nwoke onye Juu bịara ọhụrụ nꞌobodo Efesọs. Aha ya bụ Apọlọs. Ọ bụ onye ikuzi akwụkwọ nsọ were anya nke ọma. O sitere nꞌobodo Alegzanda nke dị nꞌIjipti ebe a mụrụ ya bịa Efesọs.
Igbo 2006
Ma otù onye-Ju, aha-ya bu Apọlos, onye Aleksandria n'ọmumu, nke bu onye-ọ̀kà-okwu, biaruru Efesọs; ọ di kwa ike n'ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma otu nwoke onye Juu, aha ya bụ Apọlọs, onye Alegzandria bịara na Efesọs. Ọ bụ onye ọka okwu, bụrụkwa onye maara ihe edere nʼAkwụkwọ Nsọ nke ọma.