Acts 18:27 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ihe Apọlọs na-ezube nꞌuche ya bụ ijeru obodo Griis. Ụmụnna anyị kasịrị ya obi. Ha degaara ụmụnna nọ nꞌebe ahụ akwụkwọ ka ha lekọtaa Apọlọs anya nke ọma. Mgbe ọ bịaruru Griis, Onyenwe anyị jiri ya rụọ ọrụ dị ukwuu. E sitekwara nꞌaka ya gbaa ụmụ Chineke ume nꞌime nzukọ Kraịst nile dị nꞌobodo ahụ.
Igbo 2006
Mb͕e o zubere igabiga n'ofè ka ọ ba n'Akaia, umu-nna nime Kraist we me ka obi di ya ike, we degara ndi nēso uzọ Jisus akwukwọ inara ya nke-ọma: mb͕e o ruru, o yere ha aka nke-uku, bú ndi. kwereri site n'amara:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe o zubere ịga obodo Akaịa, ndị ụmụnna gbara ya ume. Ha degaara ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ akwụkwọ ka ha nabata ya. Mgbe ọ bịaruru, Onyenwe anyị sitere nʼaka ya mee ka amara ya baa ụba nʼebe ndị kwere ekwe nọ.