Acts 18:8 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Otu nwoke a na-akpọ Krispọs onyeisi nꞌụlọ nzukọ ndị Juu ahụ na ezinụlọ ya nile chegharịrị bịakwute Onyenwe anyị. E mekwara ha baptizim dị ka e mere ọtụtụ ndị ọzọ na Kọrint.
Igbo 2006
Krispọs, onye-isi ulo-nzukọ, we kwere n'Onye-nwe-ayi, ya na èzí-na-ulo-ya dum; ọtutu madu n'etiti ndi Kọrint we kwere mb͕e ha nuru, ewe me ha baptism.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Krispọs onyeisi nʼụlọ nzukọ ahụ na ezinaụlọ ya niile kweere nʼOnyenwe anyị. Ọtụtụ ndị ọzọ bi na Kọrint nụrụ okwu ahụ, kwere, e mee ha baptizim.