Acts 19:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ụfọdụ ndị Juu dịkwa ndị na-ejegharị nꞌobodo dị iche iche na-achụpụ mmụọ ọjọọ nꞌime mmadụ. Ha chọkwara ime nke a nꞌaha Jisọs. Ihe ha na-agwa mmụọ ọjọọ bụ nke a, “E ji m aha Jisọs onye Pọl na-ekwusa nye gị iwu ka i site nꞌime ya pụta.”
Igbo 2006
Ma ufọdu nime ndi-Ju ndi nējeghari, bú ndi si na ha nāchupu ndi ajọ mọ, tiye-kwa-ra-aka-ha ikpọkwasi aha Onye-nwe-ayi Jisus n'isi ndi nwere ajọ mọ ahu, nāsi, Ewerem Jisus Onye Pọl nēkwusa b͕a unu iyi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụfọdụ ndị Juu dịkwa ndị na-ejegharị nʼobodo dị iche iche na-achụpụ mmụọ ọjọọ nʼime mmadụ. Ha chọkwara ime nke a nʼaha Onyenwe anyị Jisọs na-asị, “E ji m aha Jisọs, onye Pọl na-ekwusa na-enye unu iwu ka unu site nʼime ya pụta.”