Acts 19:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nwoke ahụ mmụọ ọjọọ na-achị jidere mmadụ abụọ nꞌime ha tie ha ihe nke ukwuu, mee ka ha gbaa ọsọ. Ha gbaara ọtọ gbapụ nꞌụlọ ahụ. Ha merụkwara ahụ nke ukwuu nꞌakụkụ ahụ ha nile.
Igbo 2006
Nwoke ahu onye ajọ mọ di nime ya we wukwasi ha, karia ha abua, o nwe-kwa-ra ike n'aru-ha, ya mere ha si n'ulo ahu b͕apu, b͕ara ọtọ, emeru kwa ha aru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nwoke ahụ mmụọ ọjọọ na-achị makwasịrị ha, tie ha ihe nke ukwuu, mee ka ha gbaa ọsọ. Ha gbara ọtọ gbapụ nʼụlọ ahụ. Ha merụkwara ahụ.