Acts 19:17 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Akụkọ banyere ihe ndị a jezuru obodo Efesọs nile. Mgbe ahụ ndị Juu na ndị Griik ụfọdụ nụkwara ihe ndị a. Oke egwu jidere ndị obodo ahụ. Nꞌihi nke a, e mekwara ka aha Onyenwe anyị Jisọs daa ụda nꞌebe nile.
Igbo 2006
Ewe me ka ndi nile ndi bi n'Efesọs, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, mara nka; ha nile we tua egwu, eme-kwa-ra aha Onye-nwe-ayi Jisus ka ọ di uku.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Akụkọ banyere ihe ndị a jezuru obodo Efesọs niile. Mgbe ahụ, ndị Juu na ndị Griik ụfọdụ nụkwara ihe ndị a. Oke egwu jidekwara ha. Nʼihi nke a, e mekwara ka aha Onyenwe anyị Jisọs daa ụda nʼebe niile.