Acts 19:25 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nwoke a kpọkọtara ndị ọrụ ya nile, na ndị ọzọ ọrụ ha bụ ire chi ndị a. Ọ gwara ha okwu dị otu a sị, “Ndị a maara aha ha, okwu a bụ ihe banyere ụzọ anyị na-esi enweta akụ anyị na ihe anyị ji adị ndụ.
Igbo 2006
ndi ọ kpọkọrọ, ha na ndi nālu ọlu di otú ahu, we si, Ndikom, unu mara na ayi nwere àkù-ayi site n'ọlu a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nwoke a kpọkọtara ndị ọrụ ya niile, na ndị ya na ha na-arụkọ otu ọrụ, sị, “Ndị ibe m, unu ma na ọ bụ site nʼọrụ nke a ka anyị si enweta akụnụba anyị.