Acts 19:26 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Unu nile ahụla, nụkwa ihe nile na-aga ugbu a. Unu maara ihe nwoke a na-akpọ Pọl na-agwa mmadụ nile na chi ọ bụla e jiri aka mee abụghị ihe ọ bụla. Nꞌihi nke a ahia anyị emebiela. Ọ bụkwaghị nanị nꞌime Efesọs ka ihe ndị a na-eme, kama ndị nile nọ nꞌokpụrụ obodo anyị mazuru ihe banyere okwu a.
Igbo 2006
Ma unu nāhu nānu kwa, na ọ bughi nání n'Efesọs kama ọ fọduru ihe ntà ka ọ buru n'Esia nile, ka Pọl nka rafuru oké ìgwè madu wepu kwa ha n'ezi uzọ, ebe ọ nāsi na ihe eji aka me abughi chi:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu niile ahụla ma nụkwa, otu nwoke a na-akpọ Pọl si rafuo ọtụtụ ndị mmadụ site nʼime ka ha kwenye na chi ọbụla e ji aka mee abụghị chi. Ọ bụkwaghị naanị nʼEfesọs kama ọ fọdụrụ ihe nta ka ọ bụrụ nʼEshịa niile.