Acts 19:27 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụkwaghị nanị na ụzọ anyị si enweta ihe oriri ka a ga-emechi site nꞌozizi ọjọọ nke Pọl, kama, ọ bụrụ na anyị agba nkịtị, hapụ igbochi ozizi a, ọ gaghị adịkwa anya, chi ukwu anyị Daịana, agaghị enwekwa nsọpụrụ. Otu aka ahụ obodo Tọki na ndị nile dị iche iche agaghị akpọkwa isi ala nye ya ọzọ. Ha ga-echefukwa ihe nile banyere ya.”
Igbo 2006
ọ bughi kwa nání na ihe-ize-ndu di na agēlelì ọlu-ayi nka; kama na agāgu kwa ulo nke oké chi-nwanyi ahu, bú Daiana, n'ihe-efu, na agaje kwa isi n'idi-uku-ya weda ya n'ala, onye Esia dum na elu-uwa dum madu bi nāsọpuru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụkwaghị naanị na ihe ize ndụ dị banyere ọrụ aka anyị nke a ga elelị kama tinyere nke a, ụlọ nke oke chi nwanyị bụ Atemis agaghị enwekwa nsọpụrụ. Ya bụ, chi nwanyị nʼonwe ya bụ onye a na-efe nʼobodo Eshịa niile nakwa nʼelu ụwa niile ka a ga-anapụ nkwanye ugwu dịrị ya dịka chi.”