Acts 19:29 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌotu ntabi anya ahụ, igwe mmadụ gbakọrọ. Onye ọ bụla nꞌobodo ahụ nọ nꞌọnọdụ mgbagwoju anya. Ha nujiiri bata nꞌebe nzukọ ha, na-adọkpụgharị Gaịọs na Aristakọs ikpe ha ikpe, bụ ndị ha na Pọl na-arụkọ ọrụ.
Igbo 2006
Obodo ahu we juputa n'aghara ahu: ha we were otù obi nubà nime ebe anēkiri ihe, mb͕e ha jidesiri Gaiọs na Aristakọs, ndi Masedọnia, ndi nēso Pọl n'ije.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọgbaaghara ahụ gbasara, zuo obodo ahụ niile. Ha banyere nʼebe a na-eme ihe ileleanya, kpọpụta Gaiọs na Arịstakọs ndị Masidonia, bụ ndị ha na Pọl na-arụkọ ọrụ.