Acts 19:33 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ụfọdụ ndị Juu hụrụ Alegzanda nꞌime igwe mmadụ ahụ, dọkpụrụ ya sepụta ya nꞌihu igwe mmadụ ahụ. Alegzanda feere ha aka ka ha dere duu mgbe ọ chọrọ ikwu okwu.
Igbo 2006
Ha we si n'etiti ìgwè madu ahu nupu Aleksanda, ebe ndi-Ju nēnu ya ka o buru uzọ. Aleksanda we kpukpue ha aka, nāchọ ka ọ gọpuru ọra madu onwe-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụfọdụ ndị Juu nʼime ọgbakọ ahụ nupuru Alegzanda, sepụta ya, mee ka o buru ụzọ. Alegzanda feere ha aka ka ha dere duu mgbe ọ chọrọ ịgọrọ onwe ya nʼihu ọha mmadụ ahụ.