Acts 19:35 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌikpeazụ, onye na-elekọta obodo, kwụsịrị ha nꞌụzụ a. Ọ gwara ha okwu sị, “Ndị ikom Efesọs, onye ọ bụla maara na obodo Efesọs bụ obodo a maara aha ya nꞌihi chi anyị a na-akpọ Daịana onye oyiyi ya si nꞌeluigwe daara anyị.
Igbo 2006
Ma mb͕e ode-akwukwọ-ha mesiri ka ìgwè madu ahu jurú, ọ si, Ndikom Efesọs, Ònye di n'etiti madu nke nāmaghi na obodo ndi Efesọs bu odozi-ulo-nsọ, oké Daiana ahu, na nke arusi nke si n'elu-igwe da?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼikpeazụ, ode akwụkwọ nke obodo ahụ kwụsịrị igwe mmadụ ahụ ime ụzụ. O kwuru, “Ndị ikom Efesọs, o nwere onye na-amaghị na obodo Efesọs bụ obodo na-echekwa ụlọ ofufe Atemis, na oyiyi ya nke si nʼeluigwe daa?