Acts 19:4 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ Pọl kọwaara ha na baptizim Jọn bụ ihe gosiri na ndị e mere ya chọrọ inwe mkpebi ichegharị site na mmehie ha bịakwute Chineke. O gosikwara na ndị e mere baptizim ahụ, jikeere ịga nꞌihu ikwere na Jisọs Onye ahụ Jọn kwuru na ọ ga-abịa.
Igbo 2006
Pọl we si, Jọn ji baptism nke nchèghari eme baptism, nāsi ndi-Ju ka ha kwere n'Onye ahu Nke gaje ibia n'azu ya, nke ahu bu, na Jisus.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, Pọl sịrị, “Baptizim Jọn bụ nke gbasara nchegharị site na mmehie, na-agwa ndị mmadụ ka ha kwere nʼonye ahụ na-eso ya na-abịa, nke bụ, ikwere nʼime Jisọs.”