Acts 19:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Emesịa, Pọl jekwuuru ndị Juu nꞌụlọ nzukọ ha, na-agwa ha okwu, ma gbalịakwa ime ka ha nabata ihe ọ na-ezi ha banyere alaeze Chineke. O mere nke a ọnwa atọ.
Igbo 2006
O we ba n'ulo-nzukọ-ha, we nēkwuwa okwu ogologo ọnwa atọ, nāgwa ha okwu n'ihe nile bayere ala-eze Chineke, nēme kwa ka ha kweye ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ banyere nʼụlọ nzukọ ahụ ma were nkwuwa okwu, na ịrụ ụka nʼebe o doro anya gwasie ha okwu ike banyere alaeze Chineke. Ọ bụ ọnwa atọ ka o were ya ime nke a.