Acts 19:9 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma ụfọdụ ekwereghị okwu ya, kama ha kwuru okwu megide Jisọs. Nꞌihi nke a Pọl hapụrụ ha. Ọ gwakwaghị ha okwu Chineke ọzọ. O kewapụrụ ụmụ Chineke ka ha nwee nzukọ dị iche nꞌebe ọzọ. O bidoro nzukọ ọzọ nꞌụlọ nzukọ otu nwoke a na-akpọ Tiranọs, nke dị nꞌime obodo ahụ. Ọ na-ekwusakwa okwu Chineke nꞌebe ahụ ụbọchị nile.
Igbo 2006
Ma mb͕e obi madu ufọdu mere etili, mb͕e ha ghara kwa ikweye, nēkwu ihe ọjọ bayere Uzọ Jisus n'iru ọra madu, o we si n'ebe ha nọ pua, kewapu ndi nēso ụzọ Jisus, nēkwu okwu kwa-ubọchi n'ulo-akwukwọ Tiranọs.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ụfọdụ nʼime ha mechiri obi ha; ha juru ikwenye, kama ha kwuru okwu ọjọọ megide Ụzọ ahụ nʼihu ọgbakọ ahụ niile. Ya mere, o sitere nʼebe ha nọ pụọ, kpọrọkwa ndị na-eso ụzọ ahụ, ha na-akparịta ụka kwa ụbọchị nʼụlọ ọgbakọ Tiranọs.