Acts 2:14 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma Pita guzoro ọtọ nꞌoge ahụ. Ndị ozi iri na otu fọdụrụ guzokwara nꞌakụkụ ya. Nꞌoke olu Pita gwara igwe mmadụ ahụ nile okwu sị, “Ndị Judia! na unu ndị bi na Jerusalem, geenụ ntị ka m kọwaara unu ihe ndị a. Geekwanụ ntị nꞌokwu m chọrọ ikwu!
Igbo 2006
Ma Pita guzoro, ya na ndi-ozi iri na otù ahu, we welie olu-ya elu, gwawa ha okwu, si, Ndikom nke Judia, na unu nile ndi bi na Jerusalem, maranu nka, ge-kwa-nu nti n'okwum.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Pita guzoro, ya na ndị ozi iri na otu ahụ welie olu gwa ọgbakọ ahụ okwu, “Ndị Juu na unu ndị bi na Jerusalem, matanụ nke a, geekwanụ ntị na ihe m na-ekwu.