Acts 2:20 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌụbọchị ahụ, anwụ agaghị enyekwa ìhè, kama ọ ga-aghọ ọchịchịrị. Ọnwa ga-adịkwa ka ọbara. Ihe ndị a nile ga-emezu tupuu o ruo ụbọchị ọbịbịa Onyenwe anyị.
Igbo 2006
Anyanwu gāb͕anwe ghọ ọchichiri, Ọnwa gāb͕anwe kwa ghọ ọbara, Tutu ubọchi Onye-nwe-ayi abia, Bú oké ubọchi ahu nke nāputa ìhè:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-aghọkwa ọbara, tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa ebube.