Acts 2:22 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Ndị Izirel, geenụ ntị nꞌokwu m chọrọ ikwu. Jisọs onye Nazaret bụ nwoke Chineke gosiri unu na ọ bụ ya zitere ya. Chineke gosiri nke a site nꞌọrụ ebube nile Chineke rụrụ nꞌetiti unu site nꞌaka ya. Unu maara na nke a bụ eziokwu.
Igbo 2006
Ndikom nke Israel, nurunu okwu ndia: Jisus Onye Nazaret, bú Nwoke Nke Chineke gosiworo unu site n'ọlu di ike na ọlu-ebube na ihe-iriba-ama, nke Chineke mere site n'aka-Ya n'etiti unu, dika unu onwe-unu matara:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ndị Izrel, geenụ ntị nʼokwu a, Jisọs onye Nazaret bụ nwoke Chineke gosiri unu, site nʼọrụ dị ike, nʼọrụ ebube nakwa ihe ịrịbama niile nke Chineke rụrụ nʼetiti unu site nʼaka ya, dịka unu ji anya unu hụ.