Acts 2:23 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma ya ka e weere nye, site nꞌizu Chineke bururị ụzọ tụọ atụmatụ ya, dị ka Chineke siri mata na mbụ na a ga-arara ya nye. Ọ bụ ya ka unu kpọgidere nꞌobe site nꞌinye aka ndị na-amaghị Chineke.
Igbo 2006
Onye a, ebe ewere Ya nye site n'ìzù akara àkà nke Chineke na ọmuma-ihe Chineke buru uzọ mara, Onye a ka unu kpọgidere n'obe b͕u kwa site n'aka ndi nāmaghi iwu-ayi:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye a ka e weere nyefee unu nʼaka site na nzube nke Chineke buru ụzọ tụọ atụmatụ ya, na dịka o siri mara na mbụ, ọ bụ ya ka unu gburu ma kpọgidekwa nʼobe site nʼaka ndị na-amaghị iwu.