Acts 2:31 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ya mere Chineke jiri mee ka Devidi mata ihe ga-eme nꞌoge dị nꞌihu. Devidi hụrụ, kwuokwa okwu banyere mbilite nꞌọnwụ nke Kraịst. Ọ hụrụ na a hapụghị mkpụrụ obi Kraịst nꞌala mmụọ. Ọ hụkwara na anụ ahụ ya erekwaghị ure.
Igbo 2006
ebe o buru uzọ hu nka a o kwuru okwu bayere nbilite-n'ọnwu nke Kraist ahu, na arapughi Ya nime Hedis, anu-aru-Ya ahughi kwa ire-uré.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ebe o buuru ụzọ hụ ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu, o kwuru banyere mbilite nʼọnwụ nke Kraịst, mgbe ọ sịrị, a hapụghị ya nʼala mmụọ; anụ ahụ ya ahụghịkwa ire ure.