Acts 2:33 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Ugbu a, e buliela Jisọs elu. Ọ nọdụrụ nꞌakụkụ Chineke nꞌocheeze ya nꞌeluigwe. Ọ natala nkwa nke Mmụọ Nsọ, site nꞌaka Chineke. Ugbu a ọ na-awụsịkwa ike Mmụọ Nsọ ahụ. Unu onwe unu bụkwa ndị akaebe na nke a bụ eziokwu.
Igbo 2006
Ya mere, ebe eweliri Ya elu site n'aka-nri Chineke, ebe Ọ nata-kwa-ra n'aka Nna-Ya nkwà ahu, bú Mọ Nsọ, Ọ wusara nka unu onwe-unu nāhu nānu kwa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ebe ọ bụ na e buliela ya elu nʼaka nri Chineke. Ọ natala Mmụọ Nsọ dịka Nna ya kwere na nkwa. Ihe a unu na-ahụ na nke unu na-anụ bụ onyinye ya ọ wụkwasịrị anyị.