Acts 2:6 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ha nụrụ ụzụ ahụ, ha nile gbakọtara. Ihe ha hụrụ juru ha anya! Nꞌihi na ha nụrụ ka ndị na-eso ụzọ Kraịst na-asụ asụsụ nke onye ọ bụla nꞌime ha na-aghọta. Ndị si ebe dị iche iche bịa, nụrụ ka ndị a na-ekwu okwu nꞌasụsụ nke ha.
Igbo 2006
Ma mb͕e ùzù ahu putura, ọra madu b͕akọrọ, o we b͕a ha ghari, n'ihi na onye ọ bula n'etiti ha nānu ka ha nēkwu okwu n'asusu nke aka ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Igwe mmadụ gbakọtara nʼọnọdụ mgbagwoju anya mgbe ha nụrụ ụzụ ahụ, nʼihi na ha nụrụ ka ha na-asụ asụsụ nke onye ọbụla nʼime ha na-aghọta, nʼasụsụ obodo ha dị iche iche.