Acts 20:13 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Anyị banyere nꞌụgbọ mmiri chee ihu ịga Asọs. Ma Pọl esoghị anyị nꞌihi na o zubere iji ụkwụ ruo Asọs, ebe ọ ga-abanye nꞌụgbọ anyị.
Igbo 2006
Ma ayi onwe-ayi, ebe ayi buru uzọ je ub͕ọ, ayi nupuru ub͕ọ ahu ije Asọs, n'ihi na ayi zubere iwere Pọl n'ub͕ọ n'ebe ahu: n'ihi na otú a ka ọ karari, ebe o zubere na ya onwe-ya gāga n'ukwu-ala.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anyị onwe anyị gara nʼihu banye nʼụgbọ mmiri chee ihu ịga Asọs. Ebe anyị zubere iburu Pọl nʼụgbọ anyị. O soghị anyị nʼihi na o zubere iji ụkwụ ruo ebe ahụ.