Acts 20:24 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma akpọghị m ndụ m ihe ọ bụla karịa na m ji ya arụrụ Onyenwe anyị ọrụ, ọrụ izisa ozi ọma nye ndị ọzọ banyere oke ebere na ịhụnanya Chineke.
Igbo 2006
Ma akpọghm ndum ihe, dika ihe oké ọnu-ahia n'ebe mu onwem nọ, ka m'we b͕azue ọsọm, jezu kwa ozi nke m'natara n'aka Onye-nwe-ayi Jisus, ikwusi ozi ọma ahu ike, bú nke amara nke Chineke.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma akpọghị m ndụ m ihe ọbụla. Karịa naanị ka m gbazuo ọsọ m ma jezuokwa ozi ahụ m natara nʼaka Onyenwe anyị Jisọs, nke bụ ịkọwa banyere oziọma nke amara Chineke.