Acts 20:3 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ nọgidere na Griis ruo ọnwa atọ. Emesịa, mgbe o kpebiri isoro ụgbọ mmiri gaa Siria, ọ chọpụtara izuzu ọjọọ ndị Juu banyere ndụ ya. Ya mere, o kpebiri isite ụzọ ọzọ ka o buru ụzọ rute Masidonia.
Igbo 2006
Mb͕e ọ nọsiri ọnwa atọ n'ebe ahu, mb͕e ndi-Ju b͕a-kwa-ra ajọ ìzù megide ya, mb͕e ọ gaje inupu ub͕ọ ije Siria, o zubere isi uzọ Masedọnia laghachi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ nọrọ ọnwa atọ nʼebe ahụ. Mgbe ọ chọpụtara na ndị Juu agbaala ajọ izu megide ya dịka ọ na-ejikere iso ụgbọ mmiri gaa Siria, o kpebiri ka ya si ụzọ Masidonia laghachi.