Acts 20:35 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌoge ọ bụla, abụkwa m ihe ilere anya nye unu banyere inyere ndị ogbenye aka. Nꞌihi na echetara m okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru mgbe ọ sịrị, ‘Ọ̀ dị mma inye enye karịa ịnara anara.’ ”
Igbo 2006
N'ihe nile egosirim unu, na unu aghaghi idọb͕u onwe-unu n'ọlu otú a, na iyere ndi nādighi ike aka, na icheta okwu Onye-nwe-ayi Jisus, na Ya onwe-ya siri, Ọ di ngọzi inye ihe kari inara ihe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihe niile, abụkwa m ihe ilere anya nye unu banyere inyere ndị ogbenye aka, site nʼịrụ ọrụ nʼụzọ dị otu a, na-echetara m okwu nke Onyenwe anyị Jisọs kwuru sị, ‘Ngọzị karịrị dị nʼinye enye karịa ịnara anara.’ ”