Acts 20:9 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe Pọl kwuru okwu ruo oge dị anya ụra bidoro ịtụ otu nwokorọbịa a na-akpọ Yutikọs. Emesịa, o siri na windo dapụ daa nꞌala. Mgbe ọ daruru ala, ọ bụụrụ onye nwụrụ anwụ.
Igbo 2006
Ma otù okorọbia, aha-ya bu Yutikọs, nānọdu na window, onye oké ura nākwada; mb͕e Pọl nēkwu okwu rue oge dikari anya, ebe ura-ya kwadara ya o we si n'ulo elu nke-atọ di n'ulo ahu da n'ala, o mewo ozu mb͕e ha buliri ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu nwokorobịa a na-akpọ Yutikọs nọdụrụ ala nʼoghereikuku, ọ bụ onye oke ụra bidoro ịtụ dịka Pọl na-ekwu okwu ruo oge dị anya. Mgbe ọ dara nʼoke ụra a, o sitere na nʼụlọ elu nke atọ dapụ, daa nʼala. Mgbe e buliri ya, ọ bụ onye nwụrụ anwụ.