Acts 21:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma Pọl jụru ha ajụjụ sị, “Gịnị mere unu ji na-akwa akwa? Unu na-eme ka obi gbawaa m! Nꞌihi na ọ bụghị nanị na m jikeere ịghọ onye mkpọrọ na Jerusalem, kama ejikeere m iwere ndụ m nye nꞌihi Jisọs.”
Igbo 2006
Mb͕e ahu Pọl zara, si, Gini ka unu nēme, ebe unu nākwa ákwá nētiwa kwa obim? n'ihi na edoziwo mu onwem ọ bughi nání ka ewe kem ab͕u, kama inwu kwa ọnwu na Jerusalem n'ihi aha Onye-nwe-ayi Jisus.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Pọl zaghachiri, “Gịnị ka unu na-eme, ọ bụ akwa ka unu na-ebe, na-eme ka obi gbawaa m? Nʼihi na ọ bụghị naanị na m dị njikere ka e kee m agbụ, kama ejikekwara m iwere ndụ m nye na Jerusalem nʼihi aha Onyenwe anyị Jisọs.”