Acts 21:24 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Soro ha gaa nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke, sorokwa ha kpụchaa isi gị. Kwụọkwara ha ụgwọ ịchụ aja ịdị ọcha ha, ka ha kpụchaakwa isi ha. Ọ bụrụ na i mee nke a, ọ ga-edo onye ọ bụla anya na okwu nile e kwuru megide gị abụghị eziokwu. Ha ga-ahụkwa na gị onwe gị na-erube isi nꞌiwu Mosisi, na i sokwa anyị nwee otu uche banyere ya.
Igbo 2006
kuru ndia tiyere onwe-gi, me ka gi na ha di ọcha, kwu-kwa-ra ha ugwọ ihe ha ji chu àjà, ka ha we kọpu isi: madu nile gāmara kwa na ezi-okwu adighi n'ihe ejiwo okwu-ọnu zí ha bayere gi; kama na gi onwe-gi nāgazi kwa, nēdebe iwu-ayi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Soro ha mee omenaala ahụ nke ndị nọ na nkwa ji edo onwe ha ọcha. Kwụọrọ ha ụgwọ maka ịkpụcha isi ha. I mee otu a, mmadụ niile ga-amata na eziokwu adịghị nʼihe ndị a niile e kwuru maka gị, kama na gị onwe gị na-agazi ma na-edebekwa iwu.