Acts 21:25 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma nꞌebe ndị mba ọzọ kwere ekwe nọ, iwu na omenala ndị Juu agbasaghị ha. Anyị edegarala ha akwụkwọ gwa ka kwụsị iri ihe ọ bụla a chụrụ nꞌịta nye arụsị na iri ọbara, ma ọ bụ anụ a nyagburu anyagbu, ya na ịkwa iko.”
Igbo 2006
Ma ayi onwe-ayi zìri akwukwọ-ozi bayere ndi mba ọzọ ndi kweworo, nēnye iwu ka ha debe onwe-ha ghara imetu ihe achuru n'àjà nye arusi aka, ha na ọbara, na anu anyab͕uru anyab͕u, na ikwa-iko.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma nʼebe ndị mba ọzọ kwere ekwe nọ, anyị edegarala ha akwụkwọ gwa ha kwụsị iri ihe ọbụla a chụrụ nʼaja nye arụsị, na iri ọbara, maọbụ anụ a nyagburu anyagbu, ya na ịkwa iko.”