Acts 21:26 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Pọl nabatara atụmatụ ha. Nꞌụbọchị nke ọzọ ya ọ kpọọrọ mmadụ anọ ndị ahụ banye nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ, maka mmemme ịdị ọcha. Emesịa, ọ gara nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ kwupụta abalị ole ọ ga-abụ mmemme ịdị ọcha ha agwụchaa, na oge ịchụ aja ha nꞌotu nꞌotu ga-abụ.
Igbo 2006
Mb͕e ahu Pọl kuru ndikom ahu tiyere onwe-ya, n'ubọchi so ya o we me ka ya na ha di ọcha, we ba n'ulo uku Chineke, nēgosi nmezu ubọchi nile nke anēme ka ha di ọcha, rue mb͕e echere n'iru Chineke onyinye ahu n'ihi madu nile n'otù n'otù nime ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Pọl kpọọrọ ndị ikom anọ ndị ahụ tinyere onwe ya, nʼụbọchị so ya mee ka ya na ha dị ọcha. Mgbe ahụ, ọ banyere nʼụlọnsọ ukwu ahụ, maka ikwupụta ụbọchị ole mmemme ịdị ọcha ahụ ga-anọ tupu e mechaa ya, nakwa mgbe ịchụ aja nʼihi ha nʼotu nʼotu ga-abụ.