Acts 21:28 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ha na-eti mkpu na-asị, “Ndị ikom Izirel, nyenụ aka! Onye a bụ nwoke ahụ na-ejegharị nꞌebe nile na-ezi ozizi megidere ndị anyị. Ọ na-ezikwa ozizi megidere iwu Mosisi na ụlọ nsọ ukwu a. Ma ugbu a o merụọkwala ụlọ nsọ a site nꞌịkpọbata ndị mba ọzọ nꞌime ya.”
Igbo 2006
nēti nkpu, si, Ndikom Israel, yere ayi aka: Nka bu nwoke ahu, onye nēzí madu nile n'ebe nile ihe megide ndi-Ju, na iwu-ayi, na ebe nka: tukwasi ya o dubata-kwa-ra ndi-Grik n'ulo uku Chineke, o meruwo kwa ebe nsọ a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
na-eti mkpu, “Ndị ikom Izrel, nyerenụ anyị aka! Onye a bụ nwoke ahụ na-ejegharị nʼebe niile na-ezi ozizi megidere ndị nke anyị, iwu anyị nakwa ebe a. Ma nke kachasị nke, ọ merụọkwala ụlọnsọ a site nʼịkpọbata ndị Griik nʼime ya.”