Acts 21:3 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Anyị rutere ebe anyị nọ nwee ike ịhụ Saiprọs, ma anyị hapụrụ ịga Saiprọs chee ihu nꞌụzọ Siria, tutuu anyị erute nꞌọnụ mmiri Taịa nꞌime Siria. Ebe a ka e bupụsịrị ibu nile dị nꞌụgbọ ahụ.
Igbo 2006
Mb͕e ayi hugasiri Saiprọs anya, rapu kwa ya n'aka-ekpe, ayi we ga Siria, we pua n'ub͕ọ na Taia: n'ihi na ebe ahu ka ub͕ọ gaje ikwapu ihe di ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe anyị kwọruru ụgbọ anyị ebe anyị nwere ike ịhụ Saiprọs, anyị siri nʼaka ekpe ya gafee, ruo Siria. Anyị rutere nʼọnụ mmiri Taịa, ebe ụgbọ mmiri ga-akwapụ ibu dị nʼime ya.