Acts 21:30 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọgba aghara jupụtara nꞌobodo ahụ nile nꞌihi ama ụgha a. Oke mkpọtụ sooro ya. Ndị mmadụ gbakọtara dọkpụpụta Pọl site nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ. Nꞌotu mgbe ahụ, ha mechiri ọnụ ụzọ ụlọ nsọ ukwu ahụ.
Igbo 2006
Obodo ahu dum we me uṅara, ndi-Ju we b͕akọta: ha we jide Pọl, dọkpupu ya n'ulo uku Chineke: ngwa ngwa ewe mechie ọnu-uzọ nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọgbaaghara jupụtara nʼobodo ahụ niile. Ndị mmadụ gbakọtara dọkpụpụta Pọl site nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Nʼotu mgbe ahụ, e mechiri ọnụ ụzọ niile.