Acts 21:34 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ụfọdụ na-eti otu ihe, ma ụfọdụ na-eti ihe ọzọ. Mgbe ọchịagha na-apụghị ịchọpụta ihe bụ isi mkpọtụ na aghara ahụ, o nyere iwu ka e duru Pọl gaa nꞌogige ndị agha.
Igbo 2006
Ufọdu nime ìgwè madu ahu we ti nkpu otù ihe, ndi ọzọ ti kwa ihe ọzọ: ma mb͕e ọ nāpughi imata okwu di itukwasi obi n'ihi ùzù ahu, ọ si ka ekuru ya ba n'ulo ndi-agha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ na-eti mkpu na-ekwu otu ihe, ebe ụfọdụ na-eti na-ekwu ihe ọzọ. Mgbe ọ na-apụghị ịchọpụta ihe bụ isi mkpọtụ na ọgbaaghara ahụ, o nyere iwu ka e duru ya gaa nʼogige ndị agha.