Acts 22:14 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Mgbe ahụ ka ọ gwara m sị, ‘Chineke nna anyị ha ahọpụtala gị ịmara uche ya na ịhụ Onye nzọpụta ahụ na ịnụ okwu ya.
Igbo 2006
O we si, Chineke nke nna-ayi-hà rọputara gi imara ihe Ọ nāchọ, na ihu Onye Ezi Omume ahu, na inu olu si n'ọnu-Ya puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Mgbe ahụ, ọ sịrị, ‘Chineke nke nna nna anyị ha ahọpụtala gị ịmara uche ya na ịhụ Onye Ezi Omume ahụ na ịnụta okwu site nʼọnụ ya.