Acts 22:24 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọchịagha ahụ kpọbatara Pọl nꞌụlọ nye iwu ka a pịa ya ụtarị, ka eziokwu pụta ya nꞌọnụ. Ọ chọrọ ịmata ihe mere igwe mmadụ a ji nwee obi ụfụ nꞌebe ọ nọ.
Igbo 2006
onye-isi-ọchi-agha we si ka ekuru ya bata n'ulo ndi-agha, ọ gwa ha ka ewere ipia-ihe chọputa isi okwu n'ọnu-ya, ka o we mazu ihe mere ha ji ti nkpu megide ya otú a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
ọchịagha ahụ nyere iwu ka a kpụgaa ya nʼogige ndị agha, pịa ya ụtarị, ka eziokwu pụta ya nʼọnụ. Ọ chọrọ ịmata ihe mere ha ji eti mkpu otu a megide ya.