Acts 22:25 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma mgbe ha na-eke Pọl agbụ ịpịa ya ụtarị, Pọl jụrụ onye agha guzo ya nso ajụjụ sị, “Ọ bụ ihe ziri ezi na unu ga-eti nwa diala Rom ihe na-ekpeghị ya ikpe?”
Igbo 2006
Ma mb͕e ha chiri udọ̀-akpukpọ kesia ya, Pọl siri ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise nke guzoro n'ebe ahu, Ò ziri ezi n'iwu ka unu pia madu bu onye Rom ihe, nke bu kwa onye anāmaghi ikpé?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma mgbe ha chịịrị ụdọ akpụkpọ kechaa ya, Pọl sịrị onye agha guzo ya nso, “Ọ bụ ihe ziri ezi nʼiwu na unu ga-eti nwa afọ Rom ihe, onye na-enweghị ikpe a mara ya?”