Acts 22:28 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Abụkwa m,” ka ọchịagha kwuru, “ma o furu m ego dị ukwuu ịbụ onye Rom!” Pọl zara ya sị, “Abụ m nwa diala!”
Igbo 2006
Onye-isi-ọchi-agha we za, si, Oké ego ka mu onwem ji zuta ọnọdu onye amuru n'obodo Rom. Pọl we si, Ma amuru mu onwem onye Rom.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọchịagha ahụ zara, “ma o furu m ego dị ukwuu iji bụrụ onye Rom.” Ma Pọl sịrị, “Amụrụ m dịka nwa afọ ala a.”