Acts 22:3 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Abụ m onye Juu. Amụrụ m na Tasọs nꞌime Silisia. Azụrụ m na Jerusalem nꞌebe a nꞌụkwụ Gamaliel onye nkụzi m. Amụtara m nꞌaka ya usoro ịgbaso iwu anyị dị ka ndị Juu na ịsọpụrụ omenala anyị nꞌụzọ doro anya. Ọ na-anụ m ọkụ nꞌobi dị ka ọ na-anụkwa unu onwe unu taa.
Igbo 2006
Mu onwem bu onye-Ju, nke amuru na Tasọs nke Silisia, ma azùputaram n'obodo a, n'ukwu Gameliel, ezíwo mu ihe, dika esi edebezu iwu nke nna-ayi-hà, obim nānu ọku nye Chineke, dika unu onwe-unu nile di ta:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Abụ m onye Juu. Amụrụ m na Tasọs nʼime Silisia. Azụrụ m na obodo a nʼụkwụ Gamaliel onye nkuzi m. Anatara m ọzụzụ dị ike na ịsọpụrụ iwu nke nna nna anyị ha ejikwa m ịnụ ọkụ nʼobi na-efe Chineke dịka unu niile si eme taa.