Acts 22:30 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌechi ya, ebe ọchịagha ahụ chọrọ ịmata ihe bụ ebubo ndị Juu na-ebo Pọl, o nyere iwu ka ndị isi nchụaja na ndị ụlọ ikpe ha zukọọ. Mgbe ahụ ọ tọpụrụ agbụ e kere Pọl, duru ya gaa nꞌihu ha.
Igbo 2006
Ma n'echi-ya, ebe o nēzube imara isi okwu, ihe mere ndi-Ju nēbo ya ebubo, ọ tọpuru ya, we gwa ndi-isi-nchu-àjà na nnọkọ-ikpé nile ka ha b͕akọ, ọ we kudata Pọl, guzo ya n'iru ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼechi ya, ebe ọ chọrọ ịmata ihe bụ isi okwu na ihe mere ndị Juu ji ebo ya ebubo, o nyere iwu ka ndịisi nchụaja na ndị ụlọ ikpe ha zukọọ. Mgbe ahụ, o dupụtara Pọl, mee ka o guzo nʼihu ha.