Acts 22:5 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma onyeisi nchụaja na ụfọdụ nꞌime ndị nzukọ anyị nọ nꞌebe a pụrụ ịgba akaebe na okwu m bụ eziokwu. Anatara m nꞌaka ha akwụkwọ e deere ụmụnna anyị na Damaskọs. Nꞌime ya ka e nyere m ike ijide ndị na-eso ụzọ Jisọs na ịkpụta ha Jerusalem maka ịta ha ahụhụ.
Igbo 2006
Dika onye-isi-nchu-àjà nāb͕a-kwa-ram àmà, ya na nb͕akọ ndi-okenye nile: ndi m'nata-kwa-ra akwukwọ-ozi n'aka-ha inye umu-nne-ayi, m'we ga Damaskọs, idọkputa kwa ndi nọ n'ebe ahu n'ab͕u bia na Jerusalem, ka ewe me ka ha hu ahuhu-nmehie.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma dịka onyeisi nchụaja na nzukọ ndị okenye niile pụrụ ịgbara m akaebe. Anatakwara m nʼaka ha akwụkwọ ozi e deere ụmụnna anyị nọ na Damaskọs. Agara m ebe ahụ ịkpụta ha nʼagbụ bịa Jerusalem maka ịta ha ahụhụ.