Acts 23:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Esemokwu ha bara ụba nke ukwuu. Nꞌihi ya ha bidoro ịdọkpụgharị Pọl nꞌakụkụ nile. Nꞌikpeazụ, ọchịagha tụru egwu na ha ga-emerụ Pọl ahụ ma ọ bụ gbuo ya. Ya mere o nyere iwu ka ndị agha ya jiri ike wepụta Pọl, ka ha kpọlaa ya nꞌụlọ ebe a na-edebe ngwa agha.
Igbo 2006
Mb͕e oké esem-okwu putara, onye-isi-ọchi-agha, ebe ọ nātu egwu na ha gādọkasi Pọl ma eleghi anya, o we gwa ndi-agha ka ha rida napu ya n'ike n'etiti ha, kuta ya n'ulo ndi-agha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Esemokwu a bịara karịa, nke mere na onyeisi ọchịagha tụrụ egwu na ha ga-adọkasị Pọl. Ọ gwara ndị agha ya ka ha banye were ike kpọpụta ya, ziga ya nʼogige ndị agha.